Numbers 7:47

“na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere.”

Numbers 7:47 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 47 of 89 in Numbers chapter 7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Numbers 7 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile. Mgbe ahụ, ndị ndu , ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha. Ha wetara dịka onyinye ha nye anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara okwu sị ya, “Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị ị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.” Ya mere, Mosis nabatara ụgbọala ndị ahụ na ehi ndị ahụ, nyefee ha ndị ị nʼaka. O nyere ụmụ ọn ụgbọala abụọ na ehi anọ, dịka ọrụ ha si dị. Nye ụmụ , ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta nwa Erọn, onye nchụaja. Mosis enyeghị ụmụ ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu. Ndị ndu ụmụ niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. Nʼihi na anyị gwara okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.” Ya mere, Nashọn nwa onye si nʼebo wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ. Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, na mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye ọn nwa nyere. Nʼụbọchị nke abụọ, Netanel nwa , onyendu ebo wetara onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa . Nʼụbọchị nke atọ nwa ọn onyendu ebo ụlọn wetakwara onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa ọn wetara. Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa onyendu ebo wetara onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye ọ nwa nyere. Nʼụbọchị nke ise nwa , onyendu ebo ọn butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa nyere. Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa onyendu ebo butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa nyere. Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa , onyendu ebo butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa nyere. Nʼụbọchị nke asatọ, nwa onyendu ebo nyere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa nyere. Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa ọn onyendu ebo nyere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa ọni nyere. Nʼụbọchị nke iri, Ahieza nwa , onyendu ebo butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa nyere. Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa , onyendu ebo butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye ịel nwa nyere. Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa , onyendu ebo ị nyere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị na iri atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye nwa nyere. Ndị a bụ onyinye ndị ndu ụmụ wetara maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ: efere ọlaọcha iri na abụọ, na efere ọlaọcha ịkwọsa mmiri iri na abụọ, na efere ọlaedo iri na abụọ. Ịdị arọ nke efere ọlaọcha ọbụla dị otu narị na iri atọ. Ịdị arọ nke efere ịkwọsa mmiri ọbụla dị iri asaa. Ịdị arọ efere ọlaọcha niile ha wetara bụ puku abụọ na narị anọ, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke otu nʼime efere ọlaedo iri na abụọ ndị ahụ ụda nsure ọkụ na-esi isi ụtọ juru nʼime ha bụ iri , dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke efere ọlaedo ndị ahụ niile bụ otu narị na iri abụọ. Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ. Ndị a niile bụ onyinye e nyere maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ. Mgbe banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka anyị si gwa ya okwu.

Every verse in Numbers 7

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00