Numbers 9:13

“Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.”

Numbers 9:13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 13 of 23 in Numbers chapter 9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Numbers 9 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị gwara okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala . Ọ sịrị ya, “Gwa ụmụ ka ha mee nʼoge a kara aka. Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.” Ya mere, Mosis gwara ndị sị ha mee . Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị mere ihe niile nʼusoro dịka iwu anyị nyere si dị. Ma ụfọdụ nʼime ụmụ esoghị mee ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere na Erọn nʼụbọchị ahụ, sị , “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị ndị ọzọ iwetara anyị onyinye nʼoge a kara aka?” Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Gwa ụmụ okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee anyị. Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu. Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere , ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha. Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya. “ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na anyị, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ” Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya. Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ. Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa. Mgbe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha. Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha. Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha. Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha. Site nʼiwu anyị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu anyị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile anyị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ si dị.

Every verse in Numbers 9

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00