Proverbs 19:13

“Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.”

Proverbs 19:13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 13 of 29 in Proverbs chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Proverbs 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile. Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ. Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide anyị. Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide. Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa. Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye. Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide. Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu. Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ, onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi. Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze. Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya. Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm. Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ. Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu. Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka anyị. Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. Onye na-edebe iwu na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere. Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi. Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ. Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe. Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche anyị ga-emezu. Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya. Ịtụ egwu anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ. Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya. Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma. Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya. Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo. Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo. Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe. Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ; a ga-etikwa ha ihe.

Every verse in Proverbs 19

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00