MyBibleAtlasAbụ Ọma 119

Abụ Ọma

Abụ Ọma 119

Psalm 119 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 119Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading does not name an author. This is a wisdom Psalm that meditates on the beauty, truth and life-giving power of God's word.

Abụ Ọma 119 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu anyị si dị.

KJV verse 1: Blessed are the undefiled in the way, who walk in the law of the LORD.

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.

KJV verse 2: Blessed are they that keep his testimonies, and that seek him with the whole heart.

Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.

KJV verse 3: They also do no iniquity: they walk in his ways.

I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi.

KJV verse 4: Thou hast commanded us to keep thy precepts diligently.

Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile!

KJV verse 5: O that my ways were directed to keep thy statutes!

Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.

KJV verse 6: Then shall I not be ashamed, when I have respect unto all thy commandments.

Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

KJV verse 7: I will praise thee with uprightness of heart, when I shall have learned thy righteous judgments.

Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. ב

KJV verse 8: I will keep thy statutes: O forsake me not utterly.

Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.

KJV verse 9: Wherewithal shall a young man cleanse his way? by taking heed thereto according to thy word.

Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

KJV verse 10: With my whole heart have I sought thee: O let me not wander from thy commandments.

Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.

KJV verse 11: Thy word have I hid in mine heart, that I might not sin against thee.

Otuto dịrị gị, o anyị; kuziere m iwu gị niile.

KJV verse 12: Blessed art thou, O LORD: teach me thy statutes.

Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị.

KJV verse 13: With my lips have I declared all the judgments of thy mouth.

Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.

KJV verse 14: I have rejoiced in the way of thy testimonies, as much as in all riches.

Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.

KJV verse 15: I will meditate in thy precepts, and have respect unto thy ways.

Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. ג

KJV verse 16: I will delight myself in thy statutes: I will not forget thy word.

Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi.

KJV verse 17: Deal bountifully with thy servant, that I may live, and keep thy word.

Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.

KJV verse 18: Open thou mine eyes, that I may behold wondrous things out of thy law.

Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile.

KJV verse 19: I am a stranger in the earth: hide not thy commandments from me.

Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ.

KJV verse 20: My soul breaketh for the longing that it hath unto thy judgments at all times.

Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.

KJV verse 21: Thou hast rebuked the proud that are cursed, which do err from thy commandments.

Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 22: Remove from me reproach and contempt; for I have kept thy testimonies.

Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.

KJV verse 23: Princes also did sit and speak against me: but thy servant did meditate in thy statutes.

Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. ד

KJV verse 24: Thy testimonies also are my delight and my counsellors.

Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.

KJV verse 25: My soul cleaveth unto the dust: quicken thou me according to thy word.

Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị.

KJV verse 26: I have declared my ways, and thou heardest me: teach me thy statutes.

Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.

KJV verse 27: Make me to understand the way of thy precepts: so shall I talk of thy wondrous works.

Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.

KJV verse 28: My soul melteth for heaviness: strengthen thou me according unto thy word.

Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara.

KJV verse 29: Remove from me the way of lying: and grant me thy law graciously.

Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.

KJV verse 30: I have chosen the way of truth: thy judgments have I laid before me.

O anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m.

KJV verse 31: I have stuck unto thy testimonies: O LORD, put me not to shame.

Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. ה He

KJV verse 32: I will run the way of thy commandments, when thou shalt enlarge my heart.

O anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.

KJV verse 33: Teach me, O LORD, the way of thy statutes; and I shall keep it unto the end.

Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.

KJV verse 34: Give me understanding, and I shall keep thy law; yea, I shall observe it with my whole heart.

Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.

KJV verse 35: Make me to go in the path of thy commandments; for therein do I delight.

Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.

KJV verse 36: Incline my heart unto thy testimonies, and not to covetousness.

Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.

KJV verse 37: Turn away mine eyes from beholding vanity; and quicken thou me in thy way.

Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.

KJV verse 38: Stablish thy word unto thy servant, who is devoted to thy fear.

Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

KJV verse 39: Turn away my reproach which I fear: for thy judgments are good.

Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. ו

KJV verse 40: Behold, I have longed after thy precepts: quicken me in thy righteousness.

O anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;

KJV verse 41: Let thy mercies come also unto me, O LORD, even thy salvation, according to thy word.

mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.

KJV verse 42: So shall I have wherewith to answer him that reproacheth me: for I trust in thy word.

Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.

KJV verse 43: And take not the word of truth utterly out of my mouth; for I have hoped in thy judgments.

Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi.

KJV verse 44: So shall I keep thy law continually for ever and ever.

Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 45: And I will walk at liberty: for I seek thy precepts.

Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,

KJV verse 46: I will speak of thy testimonies also before kings, and will not be ashamed.

nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.

KJV verse 47: And I will delight myself in thy commandments, which I have loved.

Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. ז

KJV verse 48: My hands also will I lift up unto thy commandments, which I have loved; and I will meditate in thy statutes.

Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya.

KJV verse 49: Remember the word unto thy servant, upon which thou hast caused me to hope.

Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.

KJV verse 50: This is my comfort in my affliction: for thy word hath quickened me.

Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.

KJV verse 51: The proud have had me greatly in derision: yet have I not declined from thy law.

O anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi.

KJV verse 52: I remembered thy judgments of old, O LORD; and have comforted myself.

Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ.

KJV verse 53: Horror hath taken hold upon me because of the wicked that forsake thy law.

Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ.

KJV verse 54: Thy statutes have been my songs in the house of my pilgrimage.

Nʼabalị, o anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị.

KJV verse 55: I have remembered thy name, O LORD, in the night, and have kept thy law.

Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi. ח

KJV verse 56: This I had, because I kept thy precepts.

O anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.

KJV verse 57: Thou art my portion, O LORD: I have said that I would keep thy words.

Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị.

KJV verse 58: I intreated thy favour with my whole heart: be merciful unto me according to thy word.

Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 59: I thought on my ways, and turned my feet unto thy testimonies.

Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.

KJV verse 60: I made haste, and delayed not to keep thy commandments.

A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị.

KJV verse 61: The bands of the wicked have robbed me: but I have not forgotten thy law.

Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.

KJV verse 62: At midnight I will rise to give thanks unto thee because of thy righteous judgments.

Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.

KJV verse 63: I am a companion of all them that fear thee, and of them that keep thy precepts.

O anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile. ט

KJV verse 64: The earth, O LORD, is full of thy mercy: teach me thy statutes.

Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o anyị.

KJV verse 65: Thou hast dealt well with thy servant, O LORD, according unto thy word.

Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.

KJV verse 66: Teach me good judgment and knowledge: for I have believed thy commandments.

Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.

KJV verse 67: Before I was afflicted I went astray: but now have I kept thy word.

I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile.

KJV verse 68: Thou art good, and doest good; teach me thy statutes.

Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.

KJV verse 69: The proud have forged a lie against me: but I will keep thy precepts with my whole heart.

Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.

KJV verse 70: Their heart is as fat as grease; but I delight in thy law.

Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.

KJV verse 71: It is good for me that I have been afflicted; that I might learn thy statutes.

Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. י

KJV verse 72: The law of thy mouth is better unto me than thousands of gold and silver.

Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.

KJV verse 73: Thy hands have made me and fashioned me: give me understanding, that I may learn thy commandments.

Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.

KJV verse 74: They that fear thee will be glad when they see me; because I have hoped in thy word.

O anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.

KJV verse 75: I know, O LORD, that thy judgments are right, and that thou in faithfulness hast afflicted me.

Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.

KJV verse 76: Let, I pray thee, thy merciful kindness be for my comfort, according to thy word unto thy servant.

Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.

KJV verse 77: Let thy tender mercies come unto me, that I may live: for thy law is my delight.

Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

KJV verse 78: Let the proud be ashamed; for they dealt perversely with me without a cause: but I will meditate in thy precepts.

Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 79: Let those that fear thee turn unto me, and those that have known thy testimonies.

Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. כ

KJV verse 80: Let my heart be sound in thy statutes; that I be not ashamed.

Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.

KJV verse 81: My soul fainteth for thy salvation: but I hope in thy word.

Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”

KJV verse 82: Mine eyes fail for thy word, saying, When wilt thou comfort me?

Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.

KJV verse 83: For I am become like a bottle in the smoke; yet do I not forget thy statutes.

Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?

KJV verse 84: How many are the days of thy servant? when wilt thou execute judgment on them that persecute me?

Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.

KJV verse 85: The proud have digged pits for me, which are not after thy law.

Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.

KJV verse 86: All thy commandments are faithful: they persecute me wrongfully; help thou me.

Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.

KJV verse 87: They had almost consumed me upon earth; but I forsook not thy precepts.

Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. ל

KJV verse 88: Quicken me after thy lovingkindness; so shall I keep the testimony of thy mouth.

O anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.

KJV verse 89: For ever, O LORD, thy word is settled in heaven.

Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.

KJV verse 90: Thy faithfulness is unto all generations: thou hast established the earth, and it abideth.

Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.

KJV verse 91: They continue this day according to thine ordinances: for all are thy servants.

A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.

KJV verse 92: Unless thy law had been my delights, I should then have perished in mine affliction.

Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.

KJV verse 93: I will never forget thy precepts: for with them thou hast quickened me.

Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 94: I am thine, save me; for I have sought thy precepts.

Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

KJV verse 95: The wicked have waited for me to destroy me: but I will consider thy testimonies.

Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. מ

KJV verse 96: I have seen an end of all perfection: but thy commandment is exceeding broad.

O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.

KJV verse 97: O how love I thy law! it is my meditation all the day.

Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile.

KJV verse 98: Thou through thy commandments hast made me wiser than mine enemies: for they are ever with me.

Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.

KJV verse 99: I have more understanding than all my teachers: for thy testimonies are my meditation.

Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.

KJV verse 100: I understand more than the ancients, because I keep thy precepts.

Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi

KJV verse 101: I have refrained my feet from every evil way, that I might keep thy word.

Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.

KJV verse 102: I have not departed from thy judgments: for thou hast taught me.

Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!

KJV verse 103: How sweet are thy words unto my taste! yea, sweeter than honey to my mouth!

A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. נ

KJV verse 104: Through thy precepts I get understanding: therefore I hate every false way.

Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

KJV verse 105: Thy word is a lamp unto my feet, and a light unto my path.

Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.

KJV verse 106: I have sworn, and I will perform it, that I will keep thy righteous judgments.

Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o anyị, dịka okwu gị si dị.

KJV verse 107: I am afflicted very much: quicken me, O LORD, according unto thy word.

O anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.

KJV verse 108: Accept, I beseech thee, the freewill offerings of my mouth, O LORD, and teach me thy judgments.

Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị.

KJV verse 109: My soul is continually in my hand: yet do I not forget thy law.

Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.

KJV verse 110: The wicked have laid a snare for me: yet I erred not from thy precepts.

Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.

KJV verse 111: Thy testimonies have I taken as an heritage for ever: for they are the rejoicing of my heart.

Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. ס

KJV verse 112: I have inclined mine heart to perform thy statutes alway, even unto the end.

Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

KJV verse 113: I hate vain thoughts: but thy law do I love.

Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.

KJV verse 114: Thou art my hiding place and my shield: I hope in thy word.

Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke m!

KJV verse 115: Depart from me, ye evildoers: for I will keep the commandments of my God.

Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa.

KJV verse 116: Uphold me according unto thy word, that I may live: and let me not be ashamed of my hope.

Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.

KJV verse 117: Hold thou me up, and I shall be safe: and I will have respect unto thy statutes continually.

Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.

KJV verse 118: Thou hast trodden down all them that err from thy statutes: for their deceit is falsehood.

Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.

KJV verse 119: Thou puttest away all the wicked of the earth like dross: therefore I love thy testimonies.

Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. ע

KJV verse 120: My flesh trembleth for fear of thee; and I am afraid of thy judgments.

Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.

KJV verse 121: I have done judgment and justice: leave me not to mine oppressors.

Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.

KJV verse 122: Be surety for thy servant for good: let not the proud oppress me.

Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.

KJV verse 123: Mine eyes fail for thy salvation, and for the word of thy righteousness.

Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 124: Deal with thy servant according unto thy mercy, and teach me thy statutes.

Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 125: I am thy servant; give me understanding, that I may know thy testimonies.

O anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị.

KJV verse 126: It is time for thee, LORD, to work: for they have made void thy law.

Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,

KJV verse 127: Therefore I love thy commandments above gold; yea, above fine gold.

nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. פ Pe

KJV verse 128: Therefore I esteem all thy precepts concerning all things to be right; and I hate every false way.

Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.

KJV verse 129: Thy testimonies are wonderful: therefore doth my soul keep them.

Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

KJV verse 130: The entrance of thy words giveth light; it giveth understanding unto the simple.

Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.

KJV verse 131: I opened my mouth, and panted: for I longed for thy commandments.

Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

KJV verse 132: Look thou upon me, and be merciful unto me, as thou usest to do unto those that love thy name.

Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.

KJV verse 133: Order my steps in thy word: and let not any iniquity have dominion over me.

Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.

KJV verse 134: Deliver me from the oppression of man: so will I keep thy precepts.

Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 135: Make thy face to shine upon thy servant; and teach me thy statutes.

Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. צ

KJV verse 136: Rivers of waters run down mine eyes, because they keep not thy law.

O anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi.

KJV verse 137: Righteous art thou, O LORD, and upright are thy judgments.

Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi.

KJV verse 138: Thy testimonies that thou hast commanded are righteous and very faithful.

Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.

KJV verse 139: My zeal hath consumed me, because mine enemies have forgotten thy words.

Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.

KJV verse 140: Thy word is very pure: therefore thy servant loveth it.

Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.

KJV verse 141: I am small and despised: yet do not I forget thy precepts.

Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu.

KJV verse 142: Thy righteousness is an everlasting righteousness, and thy law is the truth.

Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.

KJV verse 143: Trouble and anguish have taken hold on me: yet thy commandments are my delights.

Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. ק

KJV verse 144: The righteousness of thy testimonies is everlasting: give me understanding, and I shall live.

Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 145: I cried with my whole heart; hear me, O LORD: I will keep thy statutes.

Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 146: I cried unto thee; save me, and I shall keep thy testimonies.

Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị.

KJV verse 147: I prevented the dawning of the morning, and cried: I hoped in thy word.

Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.

KJV verse 148: Mine eyes prevent the night watches, that I might meditate in thy word.

Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o anyị, dịka iwu gị niile si dị.

KJV verse 149: Hear my voice according unto thy lovingkindness: O LORD, quicken me according to thy judgment.

Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.

KJV verse 150: They draw nigh that follow after mischief: they are far from thy law.

Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.

KJV verse 151: Thou art near, O LORD; and all thy commandments are truth.

Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. ר

KJV verse 152: Concerning thy testimonies, I have known of old that thou hast founded them for ever.

Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.

KJV verse 153: Consider mine affliction, and deliver me: for I do not forget thy law.

Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.

KJV verse 154: Plead my cause, and deliver me: quicken me according to thy word.

Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 155: Salvation is far from the wicked: for they seek not thy statutes.

O anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.

KJV verse 156: Great are thy tender mercies, O LORD: quicken me according to thy judgments.

Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.

KJV verse 157: Many are my persecutors and mine enemies; yet do I not decline from thy testimonies.

Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.

KJV verse 158: I beheld the transgressors, and was grieved; because they kept not thy word.

Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.

KJV verse 159: Consider how I love thy precepts: quicken me, O LORD, according to thy lovingkindness.

Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. ש na

KJV verse 160: Thy word is true from the beginning: and every one of thy righteous judgments endureth for ever.

Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.

KJV verse 161: Princes have persecuted me without a cause: but my heart standeth in awe of thy word.

Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.

KJV verse 162: I rejoice at thy word, as one that findeth great spoil.

Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

KJV verse 163: I hate and abhor lying: but thy law do I love.

Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.

KJV verse 164: Seven times a day do I praise thee because of thy righteous judgments.

Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.

KJV verse 165: Great peace have they which love thy law: and nothing shall offend them.

Ana m echere nzọpụta gị, o anyị, na-agbasokwa iwu gị niile.

KJV verse 166: LORD, I have hoped for thy salvation, and done thy commandments.

Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.

KJV verse 167: My soul hath kept thy testimonies; and I love them exceedingly.

Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. ת

KJV verse 168: I have kept thy precepts and thy testimonies: for all my ways are before thee.

Ka akwa m ruo gị ntị, o anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị.

KJV verse 169: Let my cry come near before thee, O LORD: give me understanding according to thy word.

Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị.

KJV verse 170: Let my supplication come before thee: deliver me according to thy word.

Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.

KJV verse 171: My lips shall utter praise, when thou hast taught me thy statutes.

Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

KJV verse 172: My tongue shall speak of thy word: for all thy commandments are righteousness.

Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.

KJV verse 173: Let thine hand help me; for I have chosen thy precepts.

Ana m ele anya nzọpụta gị, o anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m.

KJV verse 174: I have longed for thy salvation, O LORD; and thy law is my delight.

Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.

KJV verse 175: Let my soul live, and it shall praise thee; and let thy judgments help me.

Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

KJV verse 176: I have gone astray like a lost sheep; seek thy servant; for I do not forget thy commandments.

Every verse in Abụ Ọma 119

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 1190:00 / 0:00