Psalms

Psalms 146

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 146 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Toonu anyị. O mkpụrụobi m, too anyị. Aga m eto anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye m mgbe m nọ na-adị ndụ. Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ nke ọb, onye olileanya ya dị na anyị, Chineke ya. Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o ọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu anyị.

Every verse in Psalms 146

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00