Psalms

Psalms 4

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 4 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Zaa m mgbe m na-akpọku gị m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m. Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Matanụ nke ọma na anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya. Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Tụkwasịnụ anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị. Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu. Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Every verse in Psalms 4

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00