Psalms
Psalms 70
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Psalms 70 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O , gbata ọsọ bịa zọpụta m, O anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere. Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha. Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.” Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O , mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O anyị, anọla ọdụ ịbịa.
Every verse in Psalms 70
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.