MyBibleAtlasAbụ Ọma 71

Abụ Ọma

Abụ Ọma 71

Psalm 71 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 71Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading does not name an author. This is a lament Psalm that asks the God trusted from youth for refuge and deliverance in old age.

Abụ Ọma 71 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m.

KJV verse 1: In thee, O LORD, do I put my trust: let me never be put to confusion.

Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.

KJV verse 2: Deliver me in thy righteousness, and cause me to escape: incline thine ear unto me, and save me.

Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.

KJV verse 3: Be thou my strong habitation, whereunto I may continually resort: thou hast given commandment to save me; for thou art my rock and my fortress.

O m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.

KJV verse 4: Deliver me, O my God, out of the hand of the wicked, out of the hand of the unrighteous and cruel man.

Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.

KJV verse 5: For thou art my hope, O Lord GOD: thou art my trust from my youth.

Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.

KJV verse 6: By thee have I been holden up from the womb: thou art he that took me out of my mother’s bowels: my praise shall be continually of thee.

Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.

KJV verse 7: I am as a wonder unto many; but thou art my strong refuge.

Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

KJV verse 8: Let my mouth be filled with thy praise and with thy honour all the day.

Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.

KJV verse 9: Cast me not off in the time of old age; forsake me not when my strength faileth.

Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.

KJV verse 10: For mine enemies speak against me; and they that lay wait for my soul take counsel together,

Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”

KJV verse 11: Saying, God hath forsaken him: persecute and take him; for there is none to deliver him.

O , anọla m ebe dị anya; O m, bịa ngwangwa nyere m aka.

KJV verse 12: O God, be not far from me: O my God, make haste for my help.

Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.

KJV verse 13: Let them be confounded and consumed that are adversaries to my soul; let them be covered with reproach and dishonour that seek my hurt.

Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.

KJV verse 14: But I will hope continually, and will yet praise thee more and more.

Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.

KJV verse 15: My mouth shall shew forth thy righteousness and thy salvation all the day; for I know not the numbers thereof.

Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.

KJV verse 16: I will go in the strength of the Lord GOD: I will make mention of thy righteousness, even of thine only.

O , site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.

KJV verse 17: O God, thou hast taught me from my youth: and hitherto have I declared thy wondrous works.

O m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.

KJV verse 18: Now also when I am old and greyheaded, O God, forsake me not; until I have shewed thy strength unto this generation, and thy power to every one that is to come.

O , ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O , onye dị ka gị?

KJV verse 19: Thy righteousness also, O God, is very high, who hast done great things: O God, who is like unto thee!

Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.

KJV verse 20: Thou, which hast shewed me great and sore troubles, shalt quicken me again, and shalt bring me up again from the depths of the earth.

Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.

KJV verse 21: Thou shalt increase my greatness, and comfort me on every side.

O m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị nsọ nke .

KJV verse 22: I will also praise thee with the psaltery, even thy truth, O my God: unto thee will I sing with the harp, O thou Holy One of Israel.

Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.

KJV verse 23: My lips shall greatly rejoice when I sing unto thee; and my soul, which thou hast redeemed.

Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

KJV verse 24: My tongue also shall talk of thy righteousness all the day long: for they are confounded, for they are brought unto shame, that seek my hurt.

Every verse in Abụ Ọma 71

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 710:00 / 0:00