MyBibleAtlasAbụ Ọma 8

Abụ Ọma

Abụ Ọma 8

Psalm 8 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 8Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a praise Psalm that marvels at God's majesty and the dignity he gives to humanity.

Abụ Ọma 8 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.

KJV verse 1: O LORD our Lord, how excellent is thy name in all the earth! who hast set thy glory above the heavens.

Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.

KJV verse 2: Out of the mouth of babes and sucklings hast thou ordained strength because of thine enemies, that thou mightest still the enemy and the avenger.

Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha,

KJV verse 3: When I consider thy heavens, the work of thy fingers, the moon and the stars, which thou hast ordained;

gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?

KJV verse 4: What is man, that thou art mindful of him? and the son of man, that thou visitest him?

I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.

KJV verse 5: For thou hast made him a little lower than the angels, and hast crowned him with glory and honour.

I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.

KJV verse 6: Thou madest him to have dominion over the works of thy hands; thou hast put all things under his feet:

Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,

KJV verse 7: All sheep and oxen, yea, and the beasts of the field;

na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

KJV verse 8: The fowl of the air, and the fish of the sea, and whatsoever passeth through the paths of the seas.

O anyị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.

KJV verse 9: O LORD our Lord, how excellent is thy name in all the earth!

Every verse in Abụ Ọma 8

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 80:00 / 0:00