MyBibleAtlasAbụ Ọma 91

Abụ Ọma

Abụ Ọma 91

Psalm 91 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 91Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading does not name an author. This is a praise Psalm that assures those who dwell with the Most High of God's faithful protection.

Abụ Ọma 91 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo pụrụ ime ihe niile.

KJV verse 1: He that dwelleth in the secret place of the most High shall abide under the shadow of the Almighty.

Nke a ka m ga-ekwu maka anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”

KJV verse 2: I will say of the LORD, He is my refuge and my fortress: my God; in him will I trust.

Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.

KJV verse 3: Surely he shall deliver thee from the snare of the fowler, and from the noisome pestilence.

Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.

KJV verse 4: He shall cover thee with his feathers, and under his wings shalt thou trust: his truth shall be thy shield and buckler.

Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị, maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,

KJV verse 5: Thou shalt not be afraid for the terror by night; nor for the arrow that flieth by day;

maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị, ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.

KJV verse 6: Nor for the pestilence that walketh in darkness; nor for the destruction that wasteth at noonday.

Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.

KJV verse 7: A thousand shall fall at thy side, and ten thousand at thy right hand; but it shall not come nigh thee.

Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.

KJV verse 8: Only with thine eyes shalt thou behold and see the reward of the wicked.

Ọ bụrụ na i mee kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị anyị, onye bụ ebe mgbaba m,

KJV verse 9: Because thou hast made the LORD, which is my refuge, even the most High, thy habitation;

mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.

KJV verse 10: There shall no evil befall thee, neither shall any plague come nigh thy dwelling.

Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.

KJV verse 11: For he shall give his angels charge over thee, to keep thee in all thy ways.

Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

KJV verse 12: They shall bear thee up in their hands, lest thou dash thy foot against a stone.

Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.

KJV verse 13: Thou shalt tread upon the lion and adder: the young lion and the dragon shalt thou trample under feet.

“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka anyị kwuru; aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.

KJV verse 14: Because he hath set his love upon me, therefore will I deliver him: I will set him on high, because he hath known my name.

Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.

KJV verse 15: He shall call upon me, and I will answer him: I will be with him in trouble; I will deliver him, and honour him.

Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya, gosikwa ya nzọpụta m.”

KJV verse 16: With long life will I satisfy him, and shew him my salvation.

Every verse in Abụ Ọma 91

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 910:00 / 0:00