Romans 3:16
“Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile.”
Romans 3:16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 16 of 31 in Romans chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Romans 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ọ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nʼihi na ọ bụ onye ? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke dị na-ebiri mmadụ ugwu? Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị ka e weere okwu nyefee nʼaka. Gịnị ga-emezi ma ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime ha ekwesighị ntụkwasị obi? Chineke, ọ ga-eji nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha ghara ikwesi ntụkwasị obi? Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.” Ma ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nʼihi ajọ omume anyị? (Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ.) Nʼezie, ọ bụghị otu a, ọ bụrụ na ọ bụ otu a, oleekwanụ otu ga-esi kpee ụwa ikpe? Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke pụta ìhè karịa, na-ewetara otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?” Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi. Gịnị kwanụ? Anyị ọ ka ha mma? Mba, ma e meela ya rịị ka ọ pụta ìhè na mmadụ niile nọ nʼokpuru mmehie, ma ndị ma ndị mba ọzọ. Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye. Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ . Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ. Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara. Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile. Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo. Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu pụtara.” Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe nọ. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie. Ma ugbu a, emeela ka ezi omume pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya. Ezi omume a na-esite nʼebe nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime ọs ịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya. Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto . Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka ịst ọs. Onye họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya. Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na ọs. Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime ịst. Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru. Chineke ọ bụ naanị nke ndị ? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ. Nʼihi na dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume. Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya.
Every verse in Romans 3
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.