Song of Solomon 3:4
“Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.”
Song of Solomon 3:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 4 of 11 in Song of Solomon chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Song of Solomon 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya. Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya. Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. Unu ụmụ agbọghọ , eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya. Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere? Lee ọ bụ ụgbọ ọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala sokwa ya. Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị. Eze ọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere ọn rụọ. Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom , pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ ọn, bịanụ ka unu hụ ọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
Every verse in Song of Solomon 3
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.