Song of Solomon 8:11
“Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.”
Song of Solomon 8:11 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 11 of 14 in Song of Solomon chapter 8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Song of Solomon 8 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke; nke otu nne mụrụ mụ na ya m gaara esutu gị ọnụ mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya. Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet. Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m. Unu ụmụ agbọghọ , ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya. Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị. Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu. Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta ma ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị, nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya? Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya. Abụ m mgbidi, ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu. Otu a ka m siri dị nʼanya ya dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. Solomọn nwere ubi vaịnị na -, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta. Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke ọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ. Gị onye bi nʼubi a gbara ogige, gị na ndị enyi gị, kwere ka m nụ olu gị. Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya, bịakwute m dịka mgbada, maọbụ dịka nwa ele na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.
Every verse in Song of Solomon 8
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.