Zechariah 12:9
“Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso Jerusalem agha.”
Zechariah 12:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 14 in Zechariah chapter 12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Zechariah 12 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nke a bụ okwu nke anyị banyere . Ọ bụ amụma. Onyenwe anyị, onye gbasapụrụ eluigwe niile, onye tọrọ ntọala ụwa, na onye kpụrụ mmụọ nke dị nʼime mmadụ, ekwupụtala, sị, “Agaje m ime ka ọ bụrụ iko mmanya nke ga-aṅagharị ndị niile gbara ya gburugburu. Ha ga-agba na gburugburu, nọbichie ụzọ ya niile. Nʼụbọchị ahụ, mgbe mba niile nke ụwa chịkọtara onwe ha ọnụ imegide ya, aga m eme ka ọ ghọọrọ mba ndị ahụ niile nkume dị ukwuu nke a na-apụghị inugharị enugharị. Ndị niile ga-agbalị inugharị ya ga-emerụ onwe ha ahụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m etinye ụjọ nʼobi ịnyịnya niile, mee ka ndị na-agba ha ghọọ ndị ara,” otu a ka anyị kwubiri. “Aga m asaghe anya m lekwasị ụlọ nke ọma, ma aga m eme ka ịnyịnya niile nke mba niile kpuo ìsì. Mgbe ahụ, ndị ndu ga-ekwu nʼobi ha sị, ‘Ndị achọtala ike nʼihi na anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ ha.’ “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka ndị ndu niile dịrị ka ite ọkụ, nke a dọnyere nʼebe a chịkọtara nkụ. Ha ga-adịkwa ka ọkụ na-enwu enwu, nke dị nʼetiti ukwu ọka. Ha ga-ere ọkụ nʼaka nri na nʼaka ekpe, rechapụ ndị niile bi gburugburu ha. Ma mmadụ ga-ejupụtakwa nʼime . “Onyenwe anyị ga-ebu ụzọ zọpụta ebe obibi niile nke , ime ka ugwu na nsọpụrụ nke ụlọ , na nke ndị niile bi na ghara ịdị ukwuu karịa nke . Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na , mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka . Ụlọ ga-adịkwa ka , dịka Mmụọ ozi anyị, onye na-eje nʼihu ha. Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso agha. “Mgbe ahụ, aga m awụkwasị nʼụlọ na ndị niile bi na , mmụọ nke amara na nke arịrịọ amara. Ha ga-elegidekwa m anya, bụ onye ahụ ha mapuru ahụ. Ha ga-eru ụjụ nʼihi ya, dịka mmadụ si eru ụjụ nʼihi ọnwụ nke nwa a mụrụ naanị ya. Ha ga-ebekwa akwa ilu nke ukwuu dịka mmadụ sị ebe akwa maka nwa mbụ ya. Nʼụbọchị ahụ, akwa a ga-akwa na ga-adị ukwuu, dịka akwa nke ọn nʼobosara ala . Ndị ala ahụ niile ga-eru ụjụ. Ikwu ọbụla ga-eru ụjụ nke ha, ha na ndị nwunye ha. Ikwu na ndị nwunye ha, na ikwu na ndị nwunye ha, na ikwu ị, na ndị nwunye ha, na ikwu na ndị nwunye ha, na ikwu ndị ọzọ niile na ndị nwunye ha.
Every verse in Zechariah 12
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.