Zephaniah 2:3

“Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.”

Zephaniah 2:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 3 of 15 in Zephaniah chapter 2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Zephaniah 2 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, unu ndị mba ihe ihere dịrị. Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke anyị abịakwasị gị. Chọọnụ anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe anyị. Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo , obodo ọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼọd; a ga-ehopukwa ọn. Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị ; okwu anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị . Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.” Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ. Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na , ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị ọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile. “Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị , na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha. Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” otu a ka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ , kwubiri ya, “aghaghị m ime ka dịrị ka Sọdọm, mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.” Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye dị egwu ka anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. “Unu ndị , a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara. Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe. Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.

Every verse in Zephaniah 2

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00