1 Chronicles 10:4
“Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.”
1 Chronicles 10:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 4 of 14 in 1 Chronicles chapter 10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 Chronicles 10 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼoge a ndị lụsoro ndị agha, ndị si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu . Ndị ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na . Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ. Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya. Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, nwụọkwa. Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ. Mgbe ndị niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị bịakwara bichie nʼime ha. Nʼechi ya, mgbe ndị bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu . Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile. Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ ọn. Mgbe ndị niile nụrụ ihe ndị mere Sọl, ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na . Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na , buo ọnụ ụbọchị asaa. Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye anyị, o debeghị okwu anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase, ma ọ jụghị ase site nʼọnụ anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee nwa nʼaka.
Every verse in 1 Chronicles 10
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.