1 Samuel 10:6

“Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.”

1 Samuel 10:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 6 of 27 in 1 Samuel chapter 10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Samuel 10 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ, weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya? Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili na , nʼala , ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’ “Mgbe i ruru nʼosisi ukwu , ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife ofufe na . Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya. Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha. “Emesịa, ị ga-aga nke , ebe ndị agha ndị mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma. Nʼoge ahụ, mmụọ anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche. Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na nọnyeere gị. “Ị ga-aga chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.” Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ. Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere , ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma. Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa ? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?” Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?” Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu. Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?” Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ ịjụta ase ebe ha nọ.” Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe gwara gị.” Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla. Emesịa, kpọrọ nzukọ ndị niile na , ka ha bịa zute anyị. Ọ gwara ha sị, “Otu a ka anyị, Chineke kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala kpọpụta ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị , na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’ Ma ugbu a, unu ajụla unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.” mere ka ebo niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo . O mere ka ebo bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ . Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa . Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya. Ha jụrụ anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.” Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼ!” ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!” Ọzọkwa, gwara ndị ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu anyị. Emesịa, mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya. Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ , ndị ikom ndị metụrụ aka nʼobi sooro ya. Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

Every verse in 1 Samuel 10

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00