1 Samuel 13:20

“Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi.”

1 Samuel 13:20 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 20 of 23 in 1 Samuel chapter 13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 Samuel 13 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala iri afọ anọ na abụọ. Sọl sitere nʼetiti ụmụ họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na nʼala ugwu ugwu . Otu puku nọnyeere na , nʼala . Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha. Ma busoro ndị agha nọ na agha. Ndị nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala niile, kwuo sị, “Unu ndị niile, geenụ ntị.” Ya mere, ụmụ niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha agha, nʼihi nke a, ndị niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị .” Ya mere, ndị agha niile pụtakwara soro Sọl gaa . Ndị nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na nʼọwụwa anyanwụ -. Mgbe ndị agha hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla. Ndị ụfọdụ gafere Jọ ruo nʼala na . Nʼoge a, Sọl nọ na , ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ. gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru abịaghị . Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị. Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ. Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya. sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị ka ha nọ na , na-akwado ibuso anyị agha, echeere m, ‘Ugbu a, ndị ga-arịdakwute m ibuso m agha na , ma arịọbeghị m ihuọma anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.” sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe anyị gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe nọ ruo mgbe niile. Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe anyị nyere gị nʼiwu.” biliri hapụ gaa nʼala . Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii. Sọl na nwa ya nwoke , na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na nʼala , ebe ndị mara ụlọ ikwu ha na . Ụfọdụ nʼime ndị agha kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ nʼakụkụ , nke ọzọ chere ihu ịga -, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na , nke dị ọzara nso. Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala , nʼihi na ndị sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.” Izrel niile na-ejekwuru ndị maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi. Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke e kere ụzọ atọ. Nke mere na ahụtaghị mma agha maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na . Ugbu a ndị e kewapụtara iche a pụọla gaa nʼụzọ warawara dị na .

Every verse in 1 Samuel 13

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00