Acts 4:20

“Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.””

Acts 4:20 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 20 of 37 in Acts chapter 4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Acts 4 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị bịakwutere ha. Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime ọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị. Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi. Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise. Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na . Onyeisi nchụaja bụ nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na , na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja. Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?” Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye. Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya, ya mere maranụ nke a, unu na ndị niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha ọs ịst onye , onye unu kpọgidere nʼobe, ma kpọlitere ya site nʼọnwụ. Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’ Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.” Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na ọs nọkọrọ. Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a. Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na maara ihe banyere nke a. Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.” Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha ọs. Ma na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya ige unu ntị karịa ige ntị? Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.” Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto nʼihi ihe a mere. Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ. Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo , sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị , onye na-ejere gị ozi, sị: “ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide anyị na imegide ya e tere mmanụ.’ Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs , na ndị mba ọzọ, nakwa ndị ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ ọs, onye i tere mmanụ, ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu. Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla. Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ ọs.” Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu . Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere. Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ anyị ọs, oke amara bakwaara ha niile ụba. O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha, nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị. Josef onye ikwu ị, onye sitere na ọs, onye ndị ozi na-akpọ (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”). O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.

Every verse in Acts 4

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00