Deuteronomy 12:25
“Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.”
Deuteronomy 12:25 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 25 of 32 in Deuteronomy chapter 12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Deuteronomy 12 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta. Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe. Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ. Unu agaghị efe anyị unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme. Kama unu chọpụta ebe ahụ anyị unu ga-ahọpụta, site nʼetiti ebo niile, ebe ọ ga-akpọkwasị aha ya. Nʼebe ahụ ka unu ga-abịakwute ya. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu. Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu anyị unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị anyị unu gọziri unu. Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya, nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ anyị unu na-enye unu. Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọ, birikwa nʼala ahụ anyị unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ. Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ anyị unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya. Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị ị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu anyị unu. Ị gaghị achụ aja nsure ọkụ gị nʼebe ọbụla masịrị gị, ọ bụ naanị nʼebe ahụ anyị ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile. Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị anyị unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya. Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri. Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche. Kama unu ga-eri ha nʼihu anyị bụ unu, nʼebe ahụ anyị unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị ị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu anyị bụ unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara. Echefukwala ndị ị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ. Mgbe anyị, bụ gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ. Ọ bụrụ nʼebe ahụ anyị gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke anyị nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ. Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha. Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya. Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri. Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya anyị. Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ anyị ga-ahọpụta. Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja anyị gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke anyị gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja. Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya anyị gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme. Onyenwe anyị gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha. Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.” Efekwala anyị bụ gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja. Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.
Every verse in Deuteronomy 12
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.