Exodus 12:23

“Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.”

Exodus 12:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 23 of 51 in Exodus chapter 12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 thread runs through this chapter

Exodus 12 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị gwara na Erọn okwu nʼala sị ha, “Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu. Gwa ọgbakọ ụmụ niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla. Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ. Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu. Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ niile ga-egbu ya. Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ. Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya. Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ. Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a anyị. “Aga m agafe nʼala nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala , ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile na-efe ofufe. Abụ m anyị. Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị . “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala . Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri. “Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu. Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala , dịkwara ndị nwa afọ ala. Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.” Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a. Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ. Mgbe anyị ga-agafe igbu ndị , ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu. “Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu. Mgbe unu batara nʼala ahụ anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a. Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’ Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ nʼala , mgbe o gburu ndị , ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ” Ụmụ mezuru ihe niile anyị gwara ha site nʼọnụ na Erọn. Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala , malite nʼọkpara onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ. Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala , nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị. Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ. Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.” Ndị gbalịrị ime ka ụmụ hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.” Ya mere, ụmụ buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha. Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka gwara ha. Ha rịọrọ ndị ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe. Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị , ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ napụtara ndị ihe niile ha ji biri nʼụlọ. Mgbe nke a gasịrị, ụmụ malitere ije ha site na . Mgbe ha hapụrụ , na-eje ọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị. Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Ha ji ụtụ ọka ha si buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼ, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri. Tupu ha ahapụ ala , ụmụ ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ. Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị anyị niile hapụrụ . Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala . Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ maka iji iche nche sọpụrụ anyị nʼọgbọ ha niile. Onyenwe anyị kpọrọ na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara : “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ. Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu. Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya. “A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Nzukọ niile nke ụmụ ga-eme a. “Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ. Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala .” Ụmụ mere ihe ndị a niile, dịka anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ na Erọn. Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka anyị sitere nʼala dupụta ụmụ , dịka usuu ha niile si dị.

Every verse in Exodus 12

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00