Exodus 2:5
“Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya.”
Exodus 2:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 5 of 25 in Exodus chapter 2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Exodus 2 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼoge a, otu nwoke onye si nʼebo ị, gakwara lụọ otu nwaada onye ị. Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ. Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto. Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya. Ọ dịghị anya, ada bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na- ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị .” Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?” Ada zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” ọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. Mgbe ha bịaghachiri, ada gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada , ka ọ bụrụ nwa ada . Aha ada gụrụ ya bụ , nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.” Otu ụbọchị, mgbe toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye ka ọ na-eti onye ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya. Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye ahụ, lie ya nʼime aja. Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?” Ma onye ahụ jụrụ ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye ahụ?” ahụ tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.” Mgbe nụrụ ihe mere, ọ gbalịrị igbu . Ma si nʼihu gbapụ ọsọ gbaga ala . Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri. Ma o nwere otu onye nchụaja obodo mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri. Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri. Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?” Ha zara nna ha sị, “Otu onye napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.” Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.” Mosis nabatara oku ahụ kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere ọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. Zipọra mụtara nwa nwoke, onye kpọrọ aha ya ọm. Nʼihi na sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.” O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru ntị. Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na , na Aịzik, na ọb gbara. Chineke hụrụ ụmụ , ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.
Every verse in Exodus 2
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.