Jeremiah 41:2
“Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.”
Jeremiah 41:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 2 of 18 in Jeremiah chapter 41 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Jeremiah 41 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa , nwa , onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ nwa na . Mgbe soo ha niile na-eri nri, Ishmel nwa na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo nwa , nwa , bụ onye eze ọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile. Ishmel gbukwara ndị ikom niile ha na nọ na , gbukwaa ndị agha ọn nọkwa nʼebe ahụ. Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị , tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya, o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo , na ịlo na buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ anyị. Ishmel nwa sitere na pụọ izute ha, na-akwa akwa mgbe ọ na-aga. Mgbe o zutere ha, ọ sịrị ha, “Bịakwutenụ nwa .” Mgbe ha batara nʼobodo, Ishmel nwa na ndị ikom ahụ bụ ndị so ya, gburu ndị ahụ tụnye ozu ha nʼime olulu. Ma mmadụ iri nʼime ndị ahụ gwara okwu sị ya, “Biko, egbula anyị, nʼihi na anyị nwere ọka wiiti na ọka balị, na mmanụ aṅụ anyị zoro nʼime ọhịa.” Nʼihi ya, o gbughị ha, kama ọ hapụrụ ha ndụ. Olulu ahụ tụnyere ozu na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke bụ eze gwuru maka ichebe mgbe eze na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka , nwa kpojuru nʼime olulu ahụ. Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ , ọchịagha ndị nche eze mere ka nwa bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn. Mgbe nwa , na ndịisi agha ahụ niile ya na ha nọ nụrụ ihe ọjọọ nwa mere, ha duuru ndị agha ha niile pụọ ibuso nwa agha. Ha chụkwutere ya nʼebe dị nso nʼiyi ukwu ọn. Mgbe ndị ahụ niile dọtara nʼagha hụrụ nwa na ndịisi agha so ya, ha ṅụrịrị ọṅụ. Ndị ahụ niile dọtara nʼagha na , chigharịrị gafee nʼebe nwa nọ. Ma nwa , na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị . Ha gbalagara nʼala ndị Amọn. Mgbe ahụ, Johanan nwa na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka pụọ, bụ ndị ahụ nwa dọtara nʼagha na , mgbe o buuru ụzọ gbuo nwa . Ndị ọzọ si na ọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe. Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo , nke dị nso na , ebe ha bu nʼobi ịga , nʼihi ịgbanarị ndị ọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị ọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu nwa gburu nwa , onye eze ọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.
Every verse in Jeremiah 41
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.