Judges 13:23
“Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.””
Judges 13:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 23 of 25 in Judges chapter 13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Judges 13 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ndị mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị merie ha. Ndị nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ. Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye aha ya bụ . Nwoke a si nʼagbụrụ , nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa. Otu ụbọchị, mmụọ ozi anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa. Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ. Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta site nʼaka ndị .” Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi , nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya. Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye , site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’ ” Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.” Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya. Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!” Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.” Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?” Mmụọ ozi anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya. Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.” Manoa rịọrọ Mmụọ ozi anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.” Ma Mmụọ ozi anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ anyị aja.” Ma aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi anyị. Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?” Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe na nwunye ya guzo na-ele anya: Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi anyị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala. Mgbe Mmụọ ozi anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye na nwunye ya, ka ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi anyị ka ha hụrụ. Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla !” Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.” Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ . Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite. Mmụọ anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ , nke dị nʼetiti na .
Every verse in Judges 13
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.