Numbers 16:40
“dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.”
Numbers 16:40 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 40 of 50 in Numbers chapter 16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Numbers 16 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ugbu a, Kora nwa , nwa , nwa ị, na ụfọdụ ndị agbụrụ bụ , na ụmụ , na , nwa nupuru isi bilie imegide . Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị . Ha kpọrọ ọgbakọ imegide na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ anyị?” Mgbe nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ gwara na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso. Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị , na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ, mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu anyị. Onye ahụ anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ ị!” Mgbe ahụ, Mosis gwakwara okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị ị! Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na nke kewapụtara unu site na nzukọ ndị niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ niile ijere ha ozi? Ọ kpọbatala gị na ndị ị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja? Ọ bụ anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?” Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ na , ụmụ ndị ikom , ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa. Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị? Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!” Mgbe ahụ, oke iwe were . Ọ kpọkuru anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.” Mgbe ahụ, Mosis sịrị , “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu anyị. Erọn ga-abịakwa. Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.” Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na na Erọn. Mgbe kpọkọtara ndị na-eso ya imegide na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube anyị pụtara ihe nye ọgbakọ niile. Onyenwe anyị gwara na Erọn okwu sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ma na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu anyị rịọọ ya sị, “O , gị bụ nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?” Ma anyị zara sị ya, “Gwa nzukọ niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu , Datan na .’ ” Mosis biliri jekwuru na , ndị okenye sokwa . Mgbe ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.” Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu , na na . Ma na pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile. Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m. Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị anyị zitere m. Ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala anyị anya.” Mgbe kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ , na , na , na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ, ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so , na ihe niile ha nwere. Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. Ndị niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.” Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Onyenwe anyị gwara okwu sị ya, “Gwa nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile. Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị niile.” Ya mere , onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja, dịka anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ . Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere na ndị sonyere ya ghara ime ha. Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ niile malitere itamu ntamu megide na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke anyị.” Ma mgbe ọgbakọ zukọtara imegide na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube anyị pụtakwara ihe. Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ. Ma anyị gwara sị, “Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala. Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.” Erọn mere dịka kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile. O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị. Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so nwụọ nʼụbọchị gara aga. Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.
Every verse in Numbers 16
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.