Psalms 10:1

“Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?”

Psalms 10:1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 1 of 18 in Psalms chapter 10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 10 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu? Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya. Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ. Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ , nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile. Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.” Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha. Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye. Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha. Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.” Bilie O anyị! O welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? Ma gị, O , ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta. Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. O anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.

Every verse in Psalms 10

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00