Psalms
Psalms 108
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Psalms 108 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Obi m dị njikere, o ; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu. Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. Aga m eto gị, O anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. Ka e bulie gị elu, o , karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa , tụkwaa ọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya. bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m. bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi , ana m eti mkpu mmeri.” Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm? Ọ bụghị gị, o ? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. Site na , anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Every verse in Psalms 108
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.