MyBibleAtlasAbụ Ọma 109

Abụ Ọma

Abụ Ọma 109

Psalm 109 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 109Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a lament Psalm that appeals for justice against malicious accusers and mercy for the needy.

Abụ Ọma 109 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O , onye m na-eto, anọgidekwala na-agba nkịtị,

KJV verse 1: Hold not thy peace, O God of my praise;

nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ emegheela ọnụ ha megide m; ha aghaala ụgha megide m.

KJV verse 2: For the mouth of the wicked and the mouth of the deceitful are opened against me: they have spoken against me with a lying tongue.

Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu.

KJV verse 3: They compassed me about also with words of hatred; and fought against me without a cause.

Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere.

KJV verse 4: For my love they are my adversaries: but I give myself unto prayer.

Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere, ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.

KJV verse 5: And they have rewarded me evil for good, and hatred for my love.

Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya; ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.

KJV verse 6: Set thou a wicked man over him: and let Satan stand at his right hand.

Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara, ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.

KJV verse 7: When he shall be judged, let him be condemned: and let his prayer become sin.

Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.

KJV verse 8: Let his days be few; and let another take his office.

Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna, ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.

KJV verse 9: Let his children be fatherless, and his wife a widow.

Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi, ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.

KJV verse 10: Let his children be continually vagabonds, and beg: let them seek their bread also out of their desolate places.

Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.

KJV verse 11: Let the extortioner catch all that he hath; and let the strangers spoil his labour.

Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma; ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.

KJV verse 12: Let there be none to extend mercy unto him: neither let there be any to favour his fatherless children.

Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.

KJV verse 13: Let his posterity be cut off; and in the generation following let their name be blotted out.

Ka anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.

KJV verse 14: Let the iniquity of his fathers be remembered with the LORD; and let not the sin of his mother be blotted out.

Ka anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.

KJV verse 15: Let them be before the LORD continually, that he may cut off the memory of them from the earth.

Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.

KJV verse 16: Because that he remembered not to shew mercy, but persecuted the poor and needy man, that he might even slay the broken in heart.

Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.

KJV verse 17: As he loved cursing, so let it come unto him: as he delighted not in blessing, so let it be far from him.

O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.

KJV verse 18: As he clothed himself with cursing like as with his garment, so let it come into his bowels like water, and like oil into his bones.

Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.

KJV verse 19: Let it be unto him as the garment which covereth him, and for a girdle wherewith he is girded continually.

Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.

KJV verse 20: Let this be the reward of mine adversaries from the LORD, and of them that speak evil against my soul.

Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ anyị nyere m aka nʼihi aha gị, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.

KJV verse 21: But do thou for me, O GOD the Lord, for thy name’s sake: because thy mercy is good, deliver thou me.

Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa, obi m tiwakwara etiwa nʼime m.

KJV verse 22: For I am poor and needy, and my heart is wounded within me.

Ana m efu dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.

KJV verse 23: I am gone like the shadow when it declineth: I am tossed up and down as the locust.

Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ; ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.

KJV verse 24: My knees are weak through fasting; and my flesh faileth of fatness.

Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo, mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.

KJV verse 25: I became also a reproach unto them: when they looked upon me they shaked their heads.

Nyere m aka, o anyị m; zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.

KJV verse 26: Help me, O LORD my God: O save me according to thy mercy:

Ka ha mara na ọ bụ aka gị, na ọ bụ gị, o anyị, mere ya.

KJV verse 27: That they may know that this is thy hand; that thou, LORD, hast done it.

Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.

KJV verse 28: Let them curse, but bless thou: when they arise, let them be ashamed; but let thy servant rejoice.

A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.

KJV verse 29: Let mine adversaries be clothed with shame, and let them cover themselves with their own confusion, as with a mantle.

Aga m eji ọnụ m jaa anyị mma nke ukwuu; nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.

KJV verse 30: I will greatly praise the LORD with my mouth; yea, I will praise him among the multitude.

Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa, ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.

KJV verse 31: For he shall stand at the right hand of the poor, to save him from those that condemn his soul.

Every verse in Abụ Ọma 109

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 1090:00 / 0:00