Psalms 116:11

“nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.””

Psalms 116:11 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 11 of 19 in Psalms chapter 116 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 116 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ahụrụ m anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere. Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile. Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. Mgbe ahụ, akpọkuru m aha anyị: “O anyị, zọpụta m!” Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na anyị emesola gị mmeso ọma. Nʼihi na gị, o anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi. Ekwenyere m na anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,” nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.” Gịnị ka m ga-enyeghachi anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha anyị. Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere anyị. Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya anyị. O anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha anyị. Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi anyị nkwa m kwere, nʼime ogige ụlọ anyị, nʼetiti gị, O . Toonu anyị.

Every verse in Psalms 116

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00