MyBibleAtlasAbụ Ọma 12

Abụ Ọma

Abụ Ọma 12

Psalm 12 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 12Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a lament Psalm that contrasts deceitful human speech with the pure words of the LORD.

Abụ Ọma 12 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.

KJV verse 1: Help, LORD; for the godly man ceaseth; for the faithful fail from among the children of men.

O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.

KJV verse 2: They speak vanity every one with his neighbour: with flattering lips and with a double heart do they speak.

Ka anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.

KJV verse 3: The LORD shall cut off all flattering lips, and the tongue that speaketh proud things:

Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”

KJV verse 4: Who have said, With our tongue will we prevail; our lips are our own: who is lord over us?

“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”

KJV verse 5: For the oppression of the poor, for the sighing of the needy, now will I arise, saith the LORD; I will set him in safety from him that puffeth at him.

Okwu ọnụ anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.

KJV verse 6: The words of the LORD are pure words: as silver tried in a furnace of earth, purified seven times.

O anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

KJV verse 7: Thou shalt keep them, O LORD, thou shalt preserve them from this generation for ever.

Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.

KJV verse 8: The wicked walk on every side, when the vilest men are exalted.

Every verse in Abụ Ọma 12

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 120:00 / 0:00