Psalms

Psalms 13

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 13 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị? Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m? Lekwasị m anya, ma zaa m, O anyị m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. Aga m abụku anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

Every verse in Psalms 13

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00