Psalms 137:8

“Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị,”

Psalms 137:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 8 of 9 in Psalms chapter 137 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 137 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼakụkụ iyi niile ọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa mgbe anyị chetara ọn. Ọ bụ nʼosisi pọpla ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile. Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ, ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ; ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ ọn!” Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ anyị ebe anyị nọ nʼala ọzọ? Ọ bụrụ na m echezọọ gị, , ka aka nri m chefuo ǹka ya. Ọ bụrụ na m echezọọ gị, ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche banyere , oke ọṅụ m, ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m. Cheta, o anyị, ihe ndị Edọm mere nʼụbọchị ahụ a dọtara nʼagha. “Tikpọsịa ya,” ka ha tiri, “Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!” Gị ada ọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi, ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị nʼihi ihe i mere anyị, onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara tụpịa ha nʼelu nkume.

Every verse in Psalms 137

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00