MyBibleAtlasAbụ Ọma 139

Abụ Ọma

Abụ Ọma 139

Psalm 139 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 139Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a praise Psalm that wonders at God's complete knowledge, presence and intimate care.

Abụ Ọma 139 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma

KJV verse 1: O LORD, thou hast searched me, and known me.

Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.

KJV verse 2: Thou knowest my downsitting and mine uprising, thou understandest my thought afar off.

Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.

KJV verse 3: Thou compassest my path and my lying down, and art acquainted with all my ways.

O anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.

KJV verse 4: For there is not a word in my tongue, but, lo, O LORD, thou knowest it altogether.

Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.

KJV verse 5: Thou hast beset me behind and before, and laid thine hand upon me.

Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.

KJV verse 6: Such knowledge is too wonderful for me; it is high, I cannot attain unto it.

Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?

KJV verse 7: Whither shall I go from thy spirit? or whither shall I flee from thy presence?

Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.

KJV verse 8: If I ascend up into heaven, thou art there: if I make my bed in hell, behold, thou art there.

Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,

KJV verse 9: If I take the wings of the morning, and dwell in the uttermost parts of the sea;

ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.

KJV verse 10: Even there shall thy hand lead me, and thy right hand shall hold me.

Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”

KJV verse 11: If I say, Surely the darkness shall cover me; even the night shall be light about me.

Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.

KJV verse 12: Yea, the darkness hideth not from thee; but the night shineth as the day: the darkness and the light are both alike to thee.

Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

KJV verse 13: For thou hast possessed my reins: thou hast covered me in my mother’s womb.

Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.

KJV verse 14: I will praise thee; for I am fearfully and wonderfully made: marvellous are thy works; and that my soul knoweth right well.

Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

KJV verse 15: My substance was not hid from thee, when I was made in secret, and curiously wrought in the lowest parts of the earth.

Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.

KJV verse 16: Thine eyes did see my substance, yet being unperfect; and in thy book all my members were written, which in continuance were fashioned, when as yet there was none of them.

Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o ! Leekwa ka ha si dị ukwuu.

KJV verse 17: How precious also are thy thoughts unto me, O God! how great is the sum of them!

Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

KJV verse 18: If I should count them, they are more in number than the sand: when I awake, I am still with thee.

O , a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!

KJV verse 19: Surely thou wilt slay the wicked, O God: depart from me therefore, ye bloody men.

Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.

KJV verse 20: For they speak against thee wickedly, and thine enemies take thy name in vain.

O anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?

KJV verse 21: Do not I hate them, O LORD, that hate thee? and am not I grieved with those that rise up against thee?

Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.

KJV verse 22: I hate them with perfect hatred: I count them mine enemies.

O , nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.

KJV verse 23: Search me, O God, and know my heart: try me, and know my thoughts:

Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.

KJV verse 24: And see if there be any wicked way in me, and lead me in the way everlasting.

Every verse in Abụ Ọma 139

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 1390:00 / 0:00