Psalms 141:2

“Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.”

Psalms 141:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 2 of 10 in Psalms chapter 141 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 141 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị. Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị. Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche. Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile. Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ. A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu. Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ. Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m. Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.

Every verse in Psalms 141

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00