Psalms

Psalms 15

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 15 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị? Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị? Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya. Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya, onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya, onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.

Every verse in Psalms 15

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00