MyBibleAtlasAbụ Ọma 23

Abụ Ọma

Abụ Ọma 23

Psalm 23 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 23Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a praise Psalm that trusts the LORD as shepherd, provider and host.

Abụ Ọma 23 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.

KJV verse 1: The LORD is my shepherd; I shall not want.

Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,

KJV verse 2: He maketh me to lie down in green pastures: he leadeth me beside the still waters.

ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.

KJV verse 3: He restoreth my soul: he leadeth me in the paths of righteousness for his name’s sake.

A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.

KJV verse 4: Yea, though I walk through the valley of the shadow of death, I will fear no evil: for thou art with me; thy rod and thy staff they comfort me.

Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.

KJV verse 5: Thou preparest a table before me in the presence of mine enemies: thou anointest my head with oil; my cup runneth over.

Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ anyị mgbe niile ebighị ebi.

KJV verse 6: Surely goodness and mercy shall follow me all the days of my life: and I will dwell in the house of the LORD for ever.

Every verse in Abụ Ọma 23

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 230:00 / 0:00