MyBibleAtlasAbụ Ọma 35

Abụ Ọma

Abụ Ọma 35

Psalm 35 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 35Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a lament Psalm that asks God to contend with unjust attackers and vindicate his servant.

Abụ Ọma 35 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.

KJV verse 1: Plead my cause, O LORD, with them that strive with me: fight against them that fight against me.

Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka.

KJV verse 2: Take hold of shield and buckler, and stand up for mine help.

Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”

KJV verse 3: Draw out also the spear, and stop the way against them that persecute me: say unto my soul, I am thy salvation.

Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere.

KJV verse 4: Let them be confounded and put to shame that seek after my soul: let them be turned back and brought to confusion that devise my hurt.

Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi anyị bụrụ onye na-achụfu ha.

KJV verse 5: Let them be as chaff before the wind: and let the angel of the LORD chase them.

Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.

KJV verse 6: Let their way be dark and slippery: and let the angel of the LORD persecute them.

Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.

KJV verse 7: For without cause have they hid for me their net in a pit, which without cause they have digged for my soul.

Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.

KJV verse 8: Let destruction come upon him at unawares; and let his net that he hath hid catch himself: into that very destruction let him fall.

Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na anyị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.

KJV verse 9: And my soul shall be joyful in the LORD: it shall rejoice in his salvation.

Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”

KJV verse 10: All my bones shall say, LORD, who is like unto thee, which deliverest the poor from him that is too strong for him, yea, the poor and the needy from him that spoileth him?

Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.

KJV verse 11: False witnesses did rise up; they laid to my charge things that I knew not.

Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.

KJV verse 12: They rewarded me evil for good to the spoiling of my soul.

Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,

KJV verse 13: But as for me, when they were sick, my clothing was sackcloth: I humbled my soul with fasting; and my prayer returned into mine own bosom.

ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.

KJV verse 14: I behaved myself as though he had been my friend or brother: I bowed down heavily, as one that mourneth for his mother.

Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.

KJV verse 15: But in mine adversity they rejoiced, and gathered themselves together: yea, the abjects gathered themselves together against me, and I knew it not; they did tear me, and ceased not:

Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.

KJV verse 16: With hypocritical mockers in feasts, they gnashed upon me with their teeth.

O anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.

KJV verse 17: Lord, how long wilt thou look on? rescue my soul from their destructions, my darling from the lions.

Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.

KJV verse 18: I will give thee thanks in the great congregation: I will praise thee among much people.

Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.

KJV verse 19: Let not them that are mine enemies wrongfully rejoice over me: neither let them wink with the eye that hate me without a cause.

Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.

KJV verse 20: For they speak not peace: but they devise deceitful matters against them that are quiet in the land.

Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”

KJV verse 21: Yea, they opened their mouth wide against me, and said, Aha, aha, our eye hath seen it.

O anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O anyị.

KJV verse 22: This thou hast seen, O LORD: keep not silence: O Lord, be not far from me.

Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.

KJV verse 23: Stir up thyself, and awake to my judgment, even unto my cause, my God and my Lord.

O anyị m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.

KJV verse 24: Judge me, O LORD my God, according to thy righteousness; and let them not rejoice over me.

Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”

KJV verse 25: Let them not say in their hearts, Ah, so would we have it: let them not say, We have swallowed him up.

Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.

KJV verse 26: Let them be ashamed and brought to confusion together that rejoice at mine hurt: let them be clothed with shame and dishonour that magnify themselves against me.

Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie anyị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”

KJV verse 27: Let them shout for joy, and be glad, that favour my righteous cause: yea, let them say continually, Let the LORD be magnified, which hath pleasure in the prosperity of his servant.

Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.

KJV verse 28: And my tongue shall speak of thy righteousness and of thy praise all the day long.

Every verse in Abụ Ọma 35

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 350:00 / 0:00