Psalms 36:7
“Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.”
Psalms 36:7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 7 of 12 in Psalms chapter 36 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 36 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu dị nʼanya ha. Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi. O anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe. Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ. Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O ! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ. Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị. Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi. Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo. Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.
Every verse in Psalms 36
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.