MyBibleAtlasAbụ Ọma 39

Abụ Ọma

Abụ Ọma 39

Psalm 39 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 39Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a lament Psalm that reflects on life's brevity and asks God to hear a tearful prayer.

Abụ Ọma 39 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”

KJV verse 1: I said, I will take heed to my ways, that I sin not with my tongue: I will keep my mouth with a bridle, while the wicked is before me.

Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara.

KJV verse 2: I was dumb with silence, I held my peace, even from good; and my sorrow was stirred.

Obi m kporo ọkụ nʼime m, ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:

KJV verse 3: My heart was hot within me, while I was musing the fire burned: then spake I with my tongue,

“O anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.

KJV verse 4: LORD, make me to know mine end, and the measure of my days, what it is; that I may know how frail I am.

I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike.

KJV verse 5: Behold, thou hast made my days as an handbreadth; and mine age is as nothing before thee: verily every man at his best state is altogether vanity. Selah.

“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.

KJV verse 6: Surely every man walketh in a vain shew: surely they are disquieted in vain: he heapeth up riches, and knoweth not who shall gather them.

“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị nʼime gị.

KJV verse 7: And now, Lord, what wait I for? my hope is in thee.

Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.

KJV verse 8: Deliver me from all my transgressions: make me not the reproach of the foolish.

Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.

KJV verse 9: I was dumb, I opened not my mouth; because thou didst it.

Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.

KJV verse 10: Remove thy stroke away from me: I am consumed by the blow of thine hand.

Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume.

KJV verse 11: When thou with rebukes dost correct man for iniquity, thou makest his beauty to consume away like a moth: surely every man is vanity. Selah.

“O anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; emechila ntị gị nye ibe akwa m. Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.

KJV verse 12: Hear my prayer, O LORD, and give ear unto my cry; hold not thy peace at my tears: for I am a stranger with thee, and a sojourner, as all my fathers were.

Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”

KJV verse 13: O spare me, that I may recover strength, before I go hence, and be no more.

Every verse in Abụ Ọma 39

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 390:00 / 0:00