Psalms 39:6

““Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.”

Psalms 39:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 6 of 13 in Psalms chapter 39 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 39 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.” Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara. Obi m kporo ọkụ nʼime m, ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; mgbe ahụ ekwuru m okwu sị: “O anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa. I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. “Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ. “Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị nʼime gị. Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu. Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a. Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ. Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. “O anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; emechila ntị gị nye ibe akwa m. Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere. Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”

Every verse in Psalms 39

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00