MyBibleAtlasAbụ Ọma 41

Abụ Ọma

Abụ Ọma 41

Psalm 41 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 41Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a lament Psalm that seeks mercy in illness and betrayal while affirming care for the poor.

Abụ Ọma 41 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye; Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.

KJV verse 1: Blessed is he that considereth the poor: the LORD will deliver him in time of trouble.

Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ; ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ, ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.

KJV verse 2: The LORD will preserve him, and keep him alive; and he shall be blessed upon the earth: and thou wilt not deliver him unto the will of his enemies.

Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike, meekwa ka ahụ dị ha mma.

KJV verse 3: The LORD will strengthen him upon the bed of languishing: thou wilt make all his bed in his sickness.

Ekwuru m sị, “O anyị, meere m ebere; gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”

KJV verse 4: I said, LORD, be merciful unto me: heal my soul; for I have sinned against thee.

Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?”

KJV verse 5: Mine enemies speak evil of me, When shall he die, and his name perish?

Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya.

KJV verse 6: And if he come to see me, he speaketh vanity: his heart gathereth iniquity to itself; when he goeth abroad, he telleth it.

Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:

KJV verse 7: All that hate me whisper together against me: against me do they devise my hurt.

“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.”

KJV verse 8: An evil disease, say they, cleaveth fast unto him: and now that he lieth he shall rise up no more.

Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.

KJV verse 9: Yea, mine own familiar friend, in whom I trusted, which did eat of my bread, hath lifted up his heel against me.

Ma gị, O anyị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.

KJV verse 10: But thou, O LORD, be merciful unto me, and raise me up, that I may requite them.

Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi, nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.

KJV verse 11: By this I know that thou favourest me, because mine enemy doth not triumph over me.

Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.

KJV verse 12: And as for me, thou upholdest me in mine integrity, and settest me before thy face for ever.

Otuto dịrị anyị, Chineke nke , site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen na Amen.

KJV verse 13: Blessed be the LORD God of Israel from everlasting, and to everlasting. Amen, and Amen.

Every verse in Abụ Ọma 41

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 410:00 / 0:00