MyBibleAtlasAbụ Ọma 45

Abụ Ọma

Abụ Ọma 45

Psalm 45 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 45Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names the sons of Korah as its authors. This is a royal Psalm that celebrates the king's majesty, justice and royal marriage.

Abụ Ọma 45 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.

KJV verse 1: My heart is inditing a good matter: I speak of the things which I have made touching the king: my tongue is the pen of a ready writer.

I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, ebe ọ bụ na agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.

KJV verse 2: Thou art fairer than the children of men: grace is poured into thy lips: therefore God hath blessed thee for ever.

Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.

KJV verse 3: Gird thy sword upon thy thigh, O most mighty, with thy glory and thy majesty.

Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.

KJV verse 4: And in thy majesty ride prosperously because of truth and meekness and righteousness; and thy right hand shall teach thee terrible things.

Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.

KJV verse 5: Thine arrows are sharp in the heart of the king’s enemies; whereby the people fall under thee.

O , ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ

KJV verse 6: Thy throne, O God, is for ever and ever: the sceptre of thy kingdom is a right sceptre.

Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.

KJV verse 7: Thou lovest righteousness, and hatest wickedness: therefore God, thy God, hath anointed thee with the oil of gladness above thy fellows.

Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.

KJV verse 8: All thy garments smell of myrrh, and aloes, and cassia, out of the ivory palaces, whereby they have made thee glad.

Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.

KJV verse 9: Kings’ daughters were among thy honourable women: upon thy right hand did stand the queen in gold of Ophir.

Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.

KJV verse 10: Hearken, O daughter, and consider, and incline thine ear; forget also thine own people, and thy father’s house;

Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”

KJV verse 11: So shall the king greatly desire thy beauty: for he is thy Lord; and worship thou him.

Ada Taịa ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.

KJV verse 12: And the daughter of Tyre shall be there with a gift; even the rich among the people shall intreat thy favour.

Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.

KJV verse 13: The king’s daughter is all glorious within: her clothing is of wrought gold.

Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.

KJV verse 14: She shall be brought unto the king in raiment of needlework: the virgins her companions that follow her shall be brought unto thee.

E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.

KJV verse 15: With gladness and rejoicing shall they be brought: they shall enter into the king’s palace.

Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.

KJV verse 16: Instead of thy fathers shall be thy children, whom thou mayest make princes in all the earth.

Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.

KJV verse 17: I will make thy name to be remembered in all generations: therefore shall the people praise thee for ever and ever.

Every verse in Abụ Ọma 45

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 450:00 / 0:00