Psalms

Psalms 46

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 46 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo , nʼime ebe obibi dị nsọ nke kachasị ihe niile elu. Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ. Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke ọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Bịa, hụrụ ihe ebube niile anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa. Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ. Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ ! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.” Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke ọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike.

Every verse in Psalms 46

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00