MyBibleAtlasAbụ Ọma 49

Abụ Ọma

Abụ Ọma 49

Psalm 49 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 49Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names the sons of Korah as its authors. This is a wisdom Psalm that teaches that wealth cannot redeem a life or defeat death.

Abụ Ọma 49 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,

KJV verse 1: Hear this, all ye people; give ear, all ye inhabitants of the world:

ma ndị dị ala ma ndị dị elu, ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.

KJV verse 2: Both low and high, rich and poor, together.

Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.

KJV verse 3: My mouth shall speak of wisdom; and the meditation of my heart shall be of understanding.

Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.

KJV verse 4: I will incline mine ear to a parable: I will open my dark saying upon the harp.

Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,

KJV verse 5: Wherefore should I fear in the days of evil, when the iniquity of my heels shall compass me about?

ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.

KJV verse 6: They that trust in their wealth, and boast themselves in the multitude of their riches;

O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye ụgwọ e ji agbara onye ahụ,

KJV verse 7: None of them can by any means redeem his brother, nor give to God a ransom for him:

nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,

KJV verse 8: (For the redemption of their soul is precious, and it ceaseth for ever:)

nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ.

KJV verse 9: That he should still live for ever, and not see corruption.

Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.

KJV verse 10: For he seeth that wise men die, likewise the fool and the brutish person perish, and leave their wealth to others.

Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi, ebe obibi ha ruo ọgbọ niile nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.

KJV verse 11: Their inward thought is, that their houses shall continue for ever, and their dwelling places to all generations; they call their lands after their own names.

Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ, dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.

KJV verse 12: Nevertheless man being in honour abideth not: he is like the beasts that perish.

Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha.

KJV verse 13: This their way is their folly: yet their posterity approve their sayings. Selah.

Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.

KJV verse 14: Like sheep they are laid in the grave; death shall feed on them; and the upright shall have dominion over them in the morning; and their beauty shall consume in the grave from their dwelling.

Ma ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya.

KJV verse 15: But God will redeem my soul from the power of the grave: for he shall receive me. Selah.

Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,

KJV verse 16: Be not thou afraid when one is made rich, when the glory of his house is increased;

nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.

KJV verse 17: For when he dieth he shall carry nothing away: his glory shall not descend after him.

Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,

KJV verse 18: Though while he lived he blessed his soul: and men will praise thee, when thou doest well to thyself.

ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.

KJV verse 19: He shall go to the generation of his fathers; they shall never see light.

Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.

KJV verse 20: Man that is in honour, and understandeth not, is like the beasts that perish.

Every verse in Abụ Ọma 49

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 490:00 / 0:00