Psalms 49:16

“Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,”

Psalms 49:16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 16 of 20 in Psalms chapter 49 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 49 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa, ma ndị dị ala ma ndị dị elu, ma onye ọgaranya ma onye ogbenye. Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta. Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m. Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu, ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha. O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye ụgwọ e ji agbara onye ahụ, nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu, nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ. Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha. Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi, ebe obibi ha ruo ọgbọ niile nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha. Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ, dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa. Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. Ma ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba, nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili. Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu, ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ. Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.

Every verse in Psalms 49

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00