Psalms 51:16

“Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.”

Psalms 51:16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 16 of 19 in Psalms chapter 51 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 51 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O , meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m. Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo. Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo. Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile. Kee obi dị ọcha nʼime m, O , nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị. O , zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị. Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. Aja chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O , ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. Ka ọ masị gị inye ọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke . Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.

Every verse in Psalms 51

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00