Psalms
Psalms 52
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Psalms 52 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, gị onye na-eleda anya? Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; ọ dị ka agụba dị nkọ, gị onye na-ebi ndụ aghụghọ. Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya. Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị, “Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!” Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu . Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya , nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.
Every verse in Psalms 52
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.