Psalms

Psalms 54

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 54 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O , jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m. O , nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị ihe ọbụla. Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma. Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

Every verse in Psalms 54

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00