MyBibleAtlasAbụ Ọma 58

Abụ Ọma

Abụ Ọma 58

Psalm 58 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 58Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a wisdom Psalm that condemns unjust rulers and affirms that God judges the earth.

Abụ Ọma 58 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?

KJV verse 1: Do ye indeed speak righteousness, O congregation? do ye judge uprightly, O ye sons of men?

Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.

KJV verse 2: Yea, in heart ye work wickedness; ye weigh the violence of your hands in the earth.

Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.

KJV verse 3: The wicked are estranged from the womb: they go astray as soon as they be born, speaking lies.

Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,

KJV verse 4: Their poison is like the poison of a serpent: they are like the deaf adder that stoppeth her ear;

nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.

KJV verse 5: Which will not hearken to the voice of charmers, charming never so wisely.

O , tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!

KJV verse 6: Break their teeth, O God, in their mouth: break out the great teeth of the young lions, O LORD.

Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.

KJV verse 7: Let them melt away as waters which run continually: when he bendeth his bow to shoot his arrows, let them be as cut in pieces.

Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.

KJV verse 8: As a snail which melteth, let every one of them pass away: like the untimely birth of a woman, that they may not see the sun.

Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.

KJV verse 9: Before your pots can feel the thorns, he shall take them away as with a whirlwind, both living, and in his wrath.

Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.

KJV verse 10: The righteous shall rejoice when he seeth the vengeance: he shall wash his feet in the blood of the wicked.

Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere onye na-ekpe ụwa ikpe.”

KJV verse 11: So that a man shall say, Verily there is a reward for the righteous: verily he is a God that judgeth in the earth.

Every verse in Abụ Ọma 58

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 580:00 / 0:00