Psalms
Psalms 57
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Psalms 57 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Meere m ebere, O , meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. Aga m akpọku nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. O , ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Obi m dị njikere, o , obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. O anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. O , ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Every verse in Psalms 57
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.